Psalms 110

Abụ Ọma Devid.

Onyenwe anyị na onye ya o tere mmanụ

1 Onyenwe anyị gwara Onyenwe m okwu sị ya:

“Nọdụ ala nʼaka nri m
ruo mgbe m ga-eme ndị iro gị
ihe mgbakwasị ụkwụ nye ụkwụ gị.”
Nʼoge ochie, a na-arụ ocheeze nʼebe dị elu, ma nwee ihe nrigo e ji arịgoru ya. Mgbe ahụ, ndị eze na-achịkwasa ụkwụ ha nʼolu ndị ha meriri nʼagha, Mat 22:44; Mak 12:36; Luk 20:42-43; Hib 1:13; 1Kọ 15:25.


2 Onyenwe anyị ga-eme ka ike ọchịchị gị site na Zayọn ruo ala ndị ọzọ;
ị ga-achị nʼetiti ndị iro gị niile.
3Nʼụbọchị ị ga-ebu agha,
ndị agha gị niile ga-ahọrọ nʼonwe ha i soro gị.
Ndị yikwasịrị ịma mma nke ịdị nsọ ka uwe,
bụ ụmụ okorobịa gị ga-abịakwute gị
dịka igirigi site nʼafọ ụtụtụ.

4 Onyenwe anyị aṅụọla iyi,
ọ gaghị agbanwe uche ya:
“Gị onwe gị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi,
nʼusoro Melkizedek.”

5Onyenwe anyị nọ nʼaka nri gị.
Ọ ga-egwepịa ndị eze nʼụbọchị oke iwe ya.
6Ọ ga-ekpe mba niile ikpe, na-atụkọta ndị nwụrụ anwụ,
ma gwepịa ndị na-achị achị nʼelu ụwa niile.
7Ọ ga-aṅụ mmiri site nʼiyi nta nke dị nʼakụkụ ụzọ;
nʼihi nke a, ọ ga-eweli isi ya elu.
Copyright information for IboBIU